ARỤ (Agwa Rụrụ Uṅyi)
Arụ bụ nsọala nke emejọrọ ala ,mmadụ ma ọ bụ chi.Ọ bụ agwa rụrụ uṅyi. Arụ bụ ihe mmadụ kpachara-anya mee.
Arụ metụtara ikwafụ ọbara, mmekọrita nwoke na nwaanyị nke omenaala igbo na-anabataghị, dika itepu ime n’ihe ndị ọzọ. Ntị nuru ya na-agbapụ aka ma si tufịakwa!
Ndị igbo were ihe ndị a dika arụ: Nna na nwa ya inwe mmekọ nwoke na nwaanyị, nne na nwa inwe mmekọ nwoke na nwaanyị, nwanne na nwanne inwe mmekọ nwoke na nwaanyị. Ndị ọzọ bụ nwaaanyị na nwaanyị inwe mmekọ, nwoke na nwoke inwe mmekọ, nwoke ma ọ bụ nwaanyị inwe mmekọ onye ọ gaghị alụ (nwa nwanne gị nwaanyị/nwa nwanne gị nwoke, nwanne nwaanyị gị/nwanne di gị). Akwụkwọ nsọ megidere agwa ọjọọ ndị a (leviticus 18:6-18).
Ịkwafụ obara n’udi ọ bụla, ikwaso nwaanyị iko n’ike, mmadụ ịdina anụmanụ, ị ji mmadụ agwọ ọgwụ ego, mmadụ igbu onwe ya, ị nara mmadụ ala ya na ike .
Ndị mmadụ n’etinye aka n’omume rụrụ arụ ndị a site n’echiche gbagọrọ agbagọ. Ụfodụ na-eme ya maka ego na ịkịkere. Nke ọzọ bụ agwa gịnị ga-eme?, anya ụkwụ. Enweghị ntụziaka gbasara omenaala di iche iche. Echeghị echiche gbasara ọghọm di na ya, maka onye buru Chi ya ụzọ ọ gbawụrụ onwe ya na-ọsọ.
Ọghọm mekụtara onye mere arụ, bụ ịkwa-ala. Onye isi ala na ndị obodo n’akpọrọ onye ahụ na ngwa ihe ndị ọ zụtara gagharịa n’obodo. Ọ n’ewedata nsọpụrụ onye ahụ na ezinaụlọ ya. Ana achụpụ onye ahu n’obodo/otu di iche iche. Ana akwụ ụgwọ ọchụ/igbu mmadụ site na-ego, ala ma ọ bụ mmadụ. ọ n’emekụta alụ m di na nwunye nke ndị ntọrọrobịa. Umụaka ndị amụtara site n’agwa ọjọọ a n’a bụ nsogbu nye obodo ha. Arụ n’ eweta onwu ike, agaghị n’ihu na ọrịa di iche iche. Arụ ndị nne na nna mere na-emekuta oganiihu na-ahụike ụmụ ụmụ ha. Onye gbụrụ nwa nne ya maka ego ma ọ bụ ala agaghị enwe ezumike na ndụ ya. Mmadụ nwere ike gaa nga(mkpọrọ) maka agwa ọjọọ ndị a. Ana ele onye dinara anụmanụ anya dika onye isi n’adighị mma. Onye mere arụ di n’ụjọ mgbe niile.
Nwa afọ igbo ọ bụla ga-enye aka ịkwusị agwa ọjọọ a site n’ịnye ndị ntọrọbịa ezigbo ndụmọdụ. Ndị nne na nna ga akọwara ụmụ ha ihe ndị bụ arụ n’obodo ha-maka ngide nnụnụ bụ n’ụtụtụ.
Ndị nwoke na ndị nwaanyi ga e nwe ụlọ ebe ndina nke ha, maka anaghị edebe ji na ewu n’otu ụlọ.
Ndị nne ga egosi ndị nwaanyị ka esi eke ekike ga ekpụshị ahụ ha nke ọma mgbe ọ bụla. Nwee ndidi ma na-agbasị mbọ ike. Maka aka ajaja butere ọnụ mmanụ mmanụ. Erela mpkụrụ obi gị maka ego .
Arụ bụ ikụkụ ọjọọ, echetala ya ma ọ bụ ime ya.
Arụ na-esi ịsị karịa nkapị/nkakwụ.